Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh,* nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem,* nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba,* nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda.

Joshua 20:7 in English

Joshua 20:7 · Berean Standard Bible

So they set apart Kedesh in Galilee in the hill country of Naphtali, Shechem in the hill country of Ephraim, and Kiriath-arba (that is, Hebron) in the hill country of Judah.

Context

5Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere. 6Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.” 7Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh,* nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem,* nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba,* nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda. 8Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta. 9Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel. 20:7 Jos 21:32; 1Ih 6:76 20:7 Jos 21:21; 2Ih 10:1 20:7 Jos 14:15; 21:11,13

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.