Joshua 20:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel. 20:7 Jos 21:32; 1Ih 6:76 20:7 Jos 21:21; 2Ih 10:1 20:7 Jos 14:15; 21:11,13
Joshua 20:9 in English
Joshua 20:9 · Berean Standard Bible
These are the cities appointed for all the Israelites and foreigners among them, so that anyone who kills a person unintentionally may flee there and not die by the hand of the avenger of blood prior to standing trial before the assembly.
Context
7Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh,* nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem,* nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba,* nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda. 8Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta. 9Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.
20:7 Jos 21:32; 1Ih 6:76
20:7 Jos 21:21; 2Ih 10:1
20:7 Jos 14:15; 21:11,13
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.