Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.

Joshua 2:4 in English

Joshua 2:4 · Berean Standard Bible

But the woman had taken the two men and hidden them. So she said, “Yes, the men did come to me, but I did not know where they had come from.

Context

2Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.” 3Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.” 4Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. 5Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” 6(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.