Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”

Joshua 2:5 in English

Joshua 2:5 · Berean Standard Bible

At dusk, when the gate was about to close, the men went out, and I do not know which way they went. Pursue them quickly, and you may catch them!”

Context

3Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.” 4Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. 5Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” 6(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.) 7Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.