Joshua 2:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
Joshua 2:17 in English
Joshua 2:17 · Berean Standard Bible
The men said to her, “We will not be bound by this oath you made us swear
Context
15Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ. 16Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.” 17Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, 18ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. 19Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.