Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.

Joshua 2:15 in English

Joshua 2:15 · Berean Standard Bible

Then Rahab let them down by a rope through the window, since the house where she lived was built into the wall of the city.

Context

13na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.” 14Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.” 15Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ. 16Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.” 17Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.