Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.

Joshua 2:18 in English

Joshua 2:18 · Berean Standard Bible

unless, when we enter the land, you have tied this scarlet cord in the window through which you let us down, and unless you have brought your father and mother and brothers and all your family into your house.

Context

16Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.” 17Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, 18ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. 19Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ. 20Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.