Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.

Joshua 19:47 in English

Joshua 19:47 · Berean Standard Bible

(Later, when the territory of the Danites was lost to them, they went up and fought against Leshem, captured it, and put it to the sword. So they took possession of Leshem, settled there, and renamed it after their father Dan.)

Context

45Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn, 46Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa. 47Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie. 48Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị. 49Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.