Joshua 16:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
Joshua 16:3 in English
Joshua 16:3 · Berean Standard Bible
Then it descended westward to the border of the Japhletites as far as the border of Lower Beth-horon and on to Gezer, and it ended at the Sea.*
Context
1Ala e kenyere ụmụ ụmụ Josef bidoro nʼosimiri Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko gbatịrị ruo nʼọzara. O sitere na Jeriko gbagoo ala ugwu ugwu ahụ, ruokwa Betel. 2O sitekwara Betel (ya bụ Luz), gafee ruo Atarọt, ebe ndị Akai bi. 3Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa. 4Ụmụ Josef bụ Ifrem, na Manase nwetara ihe nketa ha. 5Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara.
Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ malitere nʼAtarọt-Ada. Site nʼebe ahụ, o ruru nʼakụkụ elu elu Bet-Horon;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.