Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

Joshua 14:2 in English

Joshua 14:2 · Berean Standard Bible

Their inheritance was assigned by lot for the nine and a half tribes, as the LORD had commanded through Moses.

Context

1Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja,* na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere. 2Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu. 3Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha. 4Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem.* Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.