Joshua 14:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
Joshua 14:13 in English
Joshua 14:13 · Berean Standard Bible
Then Joshua blessed Caleb son of Jephunneh and gave him Hebron as his inheritance.
Context
11M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa 12Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ Onyenwe anyị kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka Onyenwe anyị, aga m achụpụ ha dịka Onyenwe anyị kwuru.” 13Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya. 14Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro Onyenwe anyị, Chineke Izrel. 15Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile.
Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.
14:1 Elieza bụ nwa Erọn. Ọpụ 6:23; 28:1
14:4 Jekọb mere ụmụ ndị ikom abụọ a mụtara Josef nʼala Ijipt ndị nke ya, ị ga-agụta nke a nʼakwụkwọ Jen 48:5 Nʼihi ọnọdụ ọhụrụ a ha nwere dịka ụmụ Jekọb, o nyere ha ikike i keta oke nʼihe o nwere, dịka ụmụ ya ndị ọzọ si keta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.