Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa. 13:1 Nʼoge a, Joshua agbaala ihe dịka iri afọ itoolu, maọbụ narị afọ, ebe Kaleb ga-adị ihe dịka iri afọ asatọ na ise. Jos 14:10; 23:1-2; 24:29 13:2 Ndị Geshua biri nʼakụkụ ọnụ mmiri nʼoke ala Ijipt, na ndịda ala Filistia. 13:27 Osimiri Galili bụkwa Osimiri Kineret

Joshua 13:33 in English

Joshua 13:33 · Berean Standard Bible

To the tribe of Levi, however, Moses had given no inheritance. The LORD, the God of Israel, is their inheritance, just as He had promised them.

Context

31ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase. 32Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko. 33Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa. 13:1 Nʼoge a, Joshua agbaala ihe dịka iri afọ itoolu, maọbụ narị afọ, ebe Kaleb ga-adị ihe dịka iri afọ asatọ na ise. Jos 14:10; 23:1-2; 24:29 13:2 Ndị Geshua biri nʼakụkụ ọnụ mmiri nʼoke ala Ijipt, na ndịda ala Filistia. 13:27 Osimiri Galili bụkwa Osimiri Kineret

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.