Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase.

Joshua 13:31 in English

Joshua 13:31 · Berean Standard Bible

half of Gilead; and Ashtaroth and Edrei, the royal cities of Og in Bashan. All this was for the clans of the descendants of Machir son of Manasseh, that is, half of the descendants of Machir.

Context

29Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị. 30Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara 31ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase. 32Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko. 33Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa. 13:1 Nʼoge a, Joshua agbaala ihe dịka iri afọ itoolu, maọbụ narị afọ, ebe Kaleb ga-adị ihe dịka iri afọ asatọ na ise. Jos 14:10; 23:1-2; 24:29 13:2 Ndị Geshua biri nʼakụkụ ọnụ mmiri nʼoke ala Ijipt, na ndịda ala Filistia. 13:27 Osimiri Galili bụkwa Osimiri Kineret

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.