Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.

Joshua 10:42 in English

Joshua 10:42 · Berean Standard Bible

And because the LORD, the God of Israel, fought for Israel, Joshua captured all these kings and their land in one campaign.

Context

40Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu. 41Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen* ruo Gibiọn. 42Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha. 43Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal. 10:6 Ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Gibiọn, pụtara na Joshua ga na-enyere ha aka, nʼoge ọbụla e nwere ndị bịara ibuso ha agha. 10:41 Ka anyị ghara iche na Goshen nke a, bụ otu ihe ya na nke ahụ dị nʼakụkụ mmiri nʼala Ijipt, nke a dị ndịda ala Palestia. Jos 11:16; 15:51

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.