Joshua 10:40
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu.
Joshua 10:40 in English
Joshua 10:40 · Berean Standard Bible
So Joshua conquered the whole region—the hill country, the Negev, the foothills,* and the slopes, together with all their kings—leaving no survivors. He devoted to destruction everything that breathed, just as the LORD, the God of Israel, had commanded.
Context
38Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha. 39Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa. 40Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu. 41Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen* ruo Gibiọn. 42Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.