Joshua 10:35
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish.
Joshua 10:35 in English
Joshua 10:35 · Berean Standard Bible
That day they captured Eglon and put it to the sword, and Joshua devoted to destruction everyone in the city, just as he had done to Lachish.
Context
33Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye. 34Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya. 35Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish. 36Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha. 37Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.