Joshua 10:34
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya.
Joshua 10:34 in English
Joshua 10:34 · Berean Standard Bible
So Joshua moved on from Lachish to Eglon, and all Israel with him. They laid siege to it and fought against it.
Context
32Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna. 33Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye. 34Emesịa, nʼụbọchị ahụ kwa, Joshua na ndị Izrel hapụrụ Lakish gaa Eglọn lụgbuo ya. 35Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish. 36Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.