Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ.

Joshua 10:37 in English

Joshua 10:37 · Berean Standard Bible

They captured it and put to the sword its king, all its villages, and all the people. Joshua left no survivors, just as he had done at Eglon; he devoted to destruction Hebron and everyone in it.

Context

35Ha were obodo ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, jiri mma agha ha tigbuo mmadụ niile dị nʼime obodo ahụ, dịka ha mere na Lakish. 36Mgbe Joshua na ndị Izrel sitere nʼEglọn pụọ, ha gara Hebrọn buso ya agha. 37Ha weere obodo ahụ, jiri mma agha gbuo eze ha, na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha gburu ndị mmadụ niile bi nʼime ya dịka ha mere nʼEglọn. Ọ dịkwaghị otu onye a hapụrụ ndụ. 38Joshua na ndị Izrel niile ya na ha so laghachiri azụ gaa busoo Debịa agha. 39Ha meriri obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, na eze ya, jiri mma agha gbuchapụ ha niile, mmadụ niile nọ nʼime ya ka ha gburu kpamkpam. Ha ahapụghị onye ọbụla ndụ, ha mere Debịa na eze ya dịka ha mere Libna na eze ya, na Hebrọn kwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.