Joshua 1:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị,
Joshua 1:12 in English
Joshua 1:12 · Berean Standard Bible
But to the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh, Joshua said,
Context
10Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, 11“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ” 12Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị, 13“Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’ 14Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.