Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,

Joshua 1:14 in English

Joshua 1:14 · Berean Standard Bible

Your wives, your young children, and your livestock may remain in the land that Moses gave you on this side of the Jordan. But all your mighty men of valor must be armed for battle to cross over ahead of your brothers and help them,

Context

12Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị, 13“Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’ 14Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka, 15tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.” 16Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.