Job 7:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
Job 7:18 in English
Job 7:18 · Berean Standard Bible
that You attend to him every morning, and test him every moment?
Context
16Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.
Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi. 17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,
i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya, 18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,
ma na-anwale ya mgbe mgbe? 19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,
maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri? 20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,
gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?
Gịnị mere i ji elekwasị m anya?
Abụrụla m ibu arọ nye gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.