Job 7:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
Job 7:19 in English
Job 7:19 · Berean Standard Bible
Will You never look away from me, or leave me alone to swallow my spittle?
Context
17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,
i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya, 18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,
ma na-anwale ya mgbe mgbe? 19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,
maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri? 20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,
gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?
Gịnị mere i ji elekwasị m anya?
Abụrụla m ibu arọ nye gị? 21Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,
ma bupụ mmehie m?
Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.
Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.