Job 5:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.
Job 5:25 in English
Job 5:25 · Berean Standard Bible
You will know that your offspring will be many, your descendants like the grass of the earth.
Context
23Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,
gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo. 24Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;
ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu. 25Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,
matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala. 26Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,
dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru. 27“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.
Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”
5:7 14:1
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.