Job 5:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;
Job 5:14 in English
Job 5:14 · Berean Standard Bible
They encounter darkness by day and grope at noon as in the night.
Context
12Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,
ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere. 13Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,
mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ. 14Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,
nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị; 15Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,
ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike. 16Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,
ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.