Job 40:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
Job 40:10 in English
Job 40:10 · Berean Standard Bible
Then adorn yourself with majesty and splendor, and clothe yourself with honor and glory.
Context
8“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m?
Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara? 9Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke?
Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya? 10Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma,
yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe. 11Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ,
weda ha nʼala, 12lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere,
ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.