Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.

Job 4:8 in English

Job 4:8 · Berean Standard Bible

As I have observed, those who plow iniquity and those who sow trouble reap the same.

Context

6Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị? 7“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi? 8Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi. 9Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha. 10Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.