Job 39:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
Job 39:3 in English
Job 39:3 · Berean Standard Bible
They crouch down and bring forth their young; they deliver their newborn.
Context
1“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?
O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya? 2Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.
Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha? 3Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.
Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa. 4Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.
Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ. 5“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?
Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.