Job 38:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
Job 38:17 in English
Job 38:17 · Berean Standard Bible
Have the gates of death been revealed to you? Have you seen the gates of the shadow of death?
Context
15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè,
meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri. 16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri,
ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri? 17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ?
Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ? 18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ?
Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile. 19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?
Olee ebe ọchịchịrị bi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.