Job 35:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
Job 35:5 in English
Job 35:5 · Berean Standard Bible
Look to the heavens and see; gaze at the clouds high above you.
Context
3Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,
gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’ 4“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,
zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ. 5Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.
Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị. 6Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?
Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya? 7Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,
maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.