Job 22:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
Job 22:24 in English
Job 22:24 · Berean Standard Bible
and consign your gold to the dust and the gold of Ophir to the stones of the ravines,
Context
22Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ,
doo okwu ya niile nʼobi gị. 23Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị;
ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị, 24tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja,
tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta. 25Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo,
bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma. 26Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ,
ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.