Job 14:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
Job 14:7 in English
Job 14:7 · Berean Standard Bible
For there is hope for a tree: If it is cut down, it will sprout again, and its tender shoots will not fail.
Context
5Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;
ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile,
kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga. 6Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya
ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ. 7“Ma olileanya dịịrị osisi;
nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa,
alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa. 8A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,
maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja, 9mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,
ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.