Job 12:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
Job 12:16 in English
Job 12:16 · Berean Standard Bible
True wisdom and power belong to Him. The deceived and the deceiver are His.
Context
14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;
mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ. 15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.
Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile. 16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;
ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya. 17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,
ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu. 18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,
ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.