Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.

Job 12:14 in English

Job 12:14 · Berean Standard Bible

What He tears down cannot be rebuilt; the man He imprisons cannot be released.

Context

12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta? 13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya. 14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ. 15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile. 16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.