Job 11:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
Job 11:4 in English
Job 11:4 · Berean Standard Bible
You have said, ‘My doctrine is sound, and I am pure in Your sight.’
Context
2“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?
A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị? 3Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?
Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo? 4Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,
adịkwa m ọcha nʼanya gị.’ 5Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,
na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị. 6Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,
nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.
Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.