Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?

Job 10:3 in English

Job 10:3 · Berean Standard Bible

Does it please You to oppress me, to reject the work of Your hands and favor the schemes of the wicked?

Context

1“Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị. 2Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe. 3Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu? 4Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ? 5Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.