Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.

Job 1:3 in English

Job 1:3 · Berean Standard Bible

and he owned 7,000 sheep, 3,000 camels, 500 yoke of oxen, 500 female donkeys, and a very large number of servants. Job was the greatest man of all the people of the East.

Context

1Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz.* Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ. 2Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ. 3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ. 4Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa. 5Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja* nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.