Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ.

Job 1:2 in English

Job 1:2 · Berean Standard Bible

He had seven sons and three daughters,

Context

1Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz.* Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ. 2Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ. 3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ. 4Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.