Native Bible

John 4:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”

John 4:52 in English

John 4:52 · Berean Standard Bible

So he inquired as to the hour when his son had recovered, and they told him, “The fever left him yesterday at the seventh hour.*”

Context

50Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” 53Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere. 54Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa. 4:7 Ndị Sameria bụ ụmụ a mụtara site nʼọlụlụ di na nwunye dị nʼetiti ụfọdụ ndị Juu ha na ndị Asịrịa. 4:18 Omume a megidere iwu Chineke banyere ọlụlụ di na nwunye.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.