Jọn 4:16
John 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
John 4:16 in English
John 4:16 · Berean Standard Bible
Jesus told her, “Go, call your husband and come back.”
Context
14Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” 15Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.” 16Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.” 17Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.”
Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di. 18I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.