Native Bible

John 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m.

John 16:3 in English

John 16:3 · Berean Standard Bible

They will do these things because they have not known the Father or Me.

Context

1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a. 3Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m. 4Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ. 5Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.