Native Bible

John 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ,* were ego ya nye ndị ogbenye?”

John 12:5 in English

John 12:5 · Berean Standard Bible

“Why wasn’t this perfume sold for three hundred denarii * and the money given to the poor?”

Context

3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ. 4Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru, 5“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ,* were ego ya nye ndị ogbenye?” 6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego. 7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.