Jọn 12:38
John 12:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”*
John 12:38 in English
John 12:38 · Berean Standard Bible
This was to fulfill the word of Isaiah the prophet: “Lord, who has believed our message? And to whom has the arm of the Lord been revealed?”*
Context
36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya. 37Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. 38Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru,
“Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị
ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”* 39Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị, 40“O meela ka ha kpuo ìsì,
mekwa ka obi ha kpọchie
Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ
maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla
Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.