Native Bible

John 11:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.

John 11:45 in English

John 11:45 · Berean Standard Bible

Therefore many of the Jews who had come to Mary, and had seen what Jesus did, believed in Him.

Context

43Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!” 44Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.” 45Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya. 46Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere. 47Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.