Jọn 11:42
John 11:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
John 11:42 in English
John 11:42 · Berean Standard Bible
I knew that You always hear Me, but I say this for the benefit of the people standing here, so they may believe that You sent Me.”
Context
40Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?” 41Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m. 42Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.” 43Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!” 44Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya.
Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.