Jọn 11:18
John 11:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
John 11:18 in English
John 11:18 · Berean Standard Bible
Now Bethany was near Jerusalem, a little less than two miles * away,
Context
16Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.” 17Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ. 18Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ. 19Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke. 20Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.