Jọn 10:23
John 10:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba* Solomọn.
John 10:23 in English
John 10:23 · Berean Standard Bible
and Jesus was walking in the temple courts * in Solomon’s Colonnade.
Context
21Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?” 22Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,* 23ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba* Solomọn. 24Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.” 25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.