Jọn 1:20
John 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
John 1:20 in English
John 1:20 · Berean Standard Bible
He did not refuse to confess, but openly declared, “I am not the Christ.”
Context
18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya. 19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ? 20O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.” 21Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?”
Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.”
“Ị bụ Onye amụma ahụ?”
“Mba.” 22Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.