Native Bible

Jeremiah 9:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.

Jeremiah 9:25 in English

Jeremiah 9:25 · Berean Standard Bible

“Behold, the days are coming,” declares the LORD, “when I will punish all who are circumcised yet uncircumcised:

Context

23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya, ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya, 24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. 25“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ. 26Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.” 9:6 Ebe obibi gị bụ nʼetiti aghụghọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.