Native Bible

Jeremiah 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.” 9:6 Ebe obibi gị bụ nʼetiti aghụghọ

Jeremiah 9:26 in English

Jeremiah 9:26 · Berean Standard Bible

Egypt, Judah, Edom, Ammon, Moab, and all the inhabitants of the desert who clip the hair of their temples. For all these nations are uncircumcised, and the whole house of Israel is uncircumcised in heart.”

Context

24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. 25“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ. 26Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.” 9:6 Ebe obibi gị bụ nʼetiti aghụghọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.