Native Bible

Jeremiah 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a.

Jeremiah 7:3 in English

Jeremiah 7:3 · Berean Standard Bible

Thus says the LORD of Hosts, the God of Israel: Correct your ways and deeds, and I will let you live in this place.

Context

1Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2“Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ Onyenwe anyị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife Onyenwe anyị ofufe. 3Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a. 4Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị!” 5Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.